Featured In

Credits

PERFORMING ARTISTS
Umu obiligbo
Umu obiligbo
Performer
COMPOSITION & LYRICS
Obiligbo Ebuka
Obiligbo Ebuka
Songwriter
Obiligbo Ifeanyi
Obiligbo Ifeanyi
Songwriter
PRODUCTION & ENGINEERING
PC Lapez
PC Lapez
Producer

Lyrics

Ị makwa ebe mmadụ jesịgolu, dịkwa ndụ nata
Chaị! Ọ kwa Chi na-edu m o
Obodo mmadu jesịgolu, dịkwa ndụ nata
Ọ kwa Chi na-edu m o
Ebe ụfọdụ jelụ, fa adịrọọ ndụ nata
Obodo ụfọdụ jelụ, fa adịrọọ ndụ nalue be fa
Oya, kenee Chukwu bi n'igwe (Aya eh)
Chukwu ọma na Ị gbanịgo (Aya eh)
Obinigwe doh doh doh doh (Aya eh)
Ọ kwa Chi na-edu m o (Aya eh)
Ndị be anyị na o seetigo (Aya eh)
Chukwu ọma nala ekene (Aya eh)
Olololo lololo (Aya eh)
Chukwu Okike na Ị dị mụ mma (Ayaya oho)
Unu fụlụ ndị dị mma abatagonụ?
N'ilu n'ilu ka anyị na-aga, azụ adịrọọ ya
Forward ever, backward never
Ọganilu ka anyị ga-enwe, alịlị adịlọọ ya
Ndị afụ che na anyị ga-ayọ fa nri
Gwa fa na ife fa bu n'obi emebigo
Ndị afụ che na anyị ga-akwụlụ ọnụ
Gwa fa na ife fa bu n'obi ayasago
Onye afụ che na nnya bụ Chukwu
Gwa ya na man no fit be God eeeh
Ife arụ m na-achọnụ bụ ụgbọ na-aga aga (Ụgbọ na-aga aga)
Obi aṅụlị na-emenụ ụwa m ọ na-atọ ụtọ (Ụwa m a na-atọ ụtọ)
Ife arụ m na-achọnụ bụ ebe a na-enwe aṅụlị, ah (Ebe a na-eli ife)
Oke olili na-emenụ ndụ m ọị na-eto ogo (Ndụ m a na-eto ogo)
Ya ka m ji wee yọba Chukwu na-enye ego
Ife anyị ga-eri akọkwana anyị
Ọ kwa Chi m ebuka eh (Aya eh)
Olololo lololo (Aya eh)
Asị m ngọzi sobe anyị oh (Aya eh)
Nnukwu ngọzi sobe anyị oh (Aya eh)
Ife ọma sobe anyị oh (Aya eh)
Ọganilu sobe anyị oh (Aya eh)
Ife dị mma sobe anyị oh (Aya eh)
Olisa doh doh doh doh (Aya eh)
Amara Chukwu sobe anyị oh (Aya eh)
Olololo lololo (Ayaya oho)
Ngọzi Chukwu na-eme m arụ m a na-ama mma (Arụ m a na-ama mma)
Mana oke olili na-eme m ndụ m a na-eto ogo (Ndụ m a na-eto ogo)
Obi aṅụlị na-ebute mmadụ a na-ama mma (Mmadụ a na-ama mma)
Mana e webe iwe na-ebute mmadụ ana ata arụ (Mmadụ a na-ata arụ)
Ọ kwa oke ọchịchọ na-ebute mmadụ a na-ezu ori (Mmadụ a na-ezu ori)
Mana i kwelụ ka ị ra na-ebute mmadu a na-adị mma (Mmadụ a na-adị mma)
Kedụ ife Chijioke na-achọ n'ọgọdọ Nwakaego? (Ọgọdọ Nwakaego)
Agbọghọbịa, kedụ ife anya gị na-acho n'akpa Tony Mbaekwe? (Akpa Tony Mbaekwe)
Mmadụ bụlụ Chukwu, alụ ga-eme (Aya eh)
Ị ma nụ oh, olololo (Aya eh)
Ah ah a, ee eh eh (Aya eh)
Iyooo oh oh (Aya eh)
Lolololo (Aya eh)
Eh eeee, eh eh (Aya eh)
Oloolo lolo (Aya eh)
Olololo lololo
Written by: Obiligbo Ebuka, Obiligbo Ifeanyi
instagramSharePathic_arrow_out