Top Songs By Umu obiligbo
Similar Songs
Credits
PERFORMING ARTISTS
Umu obiligbo
Performer
COMPOSITION & LYRICS
Umu obiligbo
Songwriter
Lyrics
Njelita ije elu oo ka m na-ekwu, eeyi ee
Ọ zikwa ife m fụlụ ka m na-ekwu eeyi
M sị na o lugo ka o si elu eeyi ee
Egwu anyị nnya ka anyị na-eti
Ụda egbe ndị nsọ, ị ma na chi na-ekpuge (Gbam selibe)
Ụmụ Obiligbo abịa ooyi, ị ma na Akụnwafọ ka m na-aza
Mụ na Ogbuọzọ nwanne m
Egwu anyị nnya ka anyị na-eti
Akụnwafọ abịa ọzọ, Ogbuọzọ nnya ka anyị na-eme
Ọ zikwa ife onye na-alụ ka nnya ji eli
Ọ kali chi ya egwu Igbo lee
Odenjinji nnenebe mmọnwụ
Ọ kwa Igbo na-ajụ m ajụjụ, otu m si eti egwu m ka ị na-ajụ
Ị ma na ike nalụ n'ụmụaka
I luzie Oando, onye nwụlụ anwụ na-abịa ụwa ọzọ
Mmụọ na-ekpoi, Ude, Ude gwanụ m ka m ma eme
Ude, Ude abaala tulee (Gbam selibe)
Ude, Ude abaala tulee (Gbam selibe)
Ude, Ude abaala tulee (Gbam selibe)
Ude, Ude na o luonụ ka o si elu (Gbam selibe)
Nnekwute mmọnwụ na-akpọ eeyi
Ị makwa na chi m na-eme ife, ị nụgokwa onu m?
Bịa leenụ na chi m na-eme mma, ị nụgokwa egwu m?
Okwu ego nnya ka anyị na-ekwu
Ị na-anụ ka egwu na-ara?
Amaalị m nke a na-eme akpa ego?
Amaalị m nke a na-eme akpa ego?
Akwa ego nnya ka mmụ na-ebe
M sị nụ nye ya ike ekele
O chi m nnya ka mmụ ji eje
Okwu ego ka mmụ na-ekwu eeyi
Ị makwa na owuite bụ ajọ ife?
Guys, ọ na bụ asị ka m na-asị?
Owuite ajọka, ife m na-afụ ka mmụ na-ekwuru yeleke
Owuite ga-eme gị ị nụbanụ ọgbọ nne yị
Owuite ga-eme gị i kwete ife dị njọ
Ọ zikwa ego bụ mma nwoke
Ọ bụụ na ị kpata ego, onye ọbụla ya-achọba ilu gị
Ma ndị ilo ya-achọba ilu gị
Ma ndị dị mma ya-achọba ilu gị
Guys ama tibelụ gị mkpu
Ị doubtụọ m, ị jụọnụ Ogbuọzọ
E jidị fine boy akpata ego?
E jilọọ fine boy akpata ego
Nwanne, jee chụba ego
Aka aja aja nyanwa ka e ji eli, ị doubtụkwaa m ị jụọ Obi Royce
Na Obi Royce ga-akọlụ gị ọfụma
Ngwa, gee mụ ntị ka m kọọlụ gị akịkọ
Akịkọ nnya ka mmụ ji abịa
Ị na-anụzikwa ije enu?
Ị ma na chi na-ekpuge (Gbam selibe)
Ụda egbe ndị nsọ, egwu anyị nnya ka anyị ji eje
Nnekwute mmọnwụ na-akpọ eeyi
Odenjinji nnenebe mmọnwụ
Mbọsị m jelụ egwu n'ana Abọ
Ọ zikwa Nteje Abọ ka m si ana
Wee pụtanụ n'Oyie Agụ, ikolobịa naabọ wee kwụdo onwe fa
A ka na-ekwu ka a na-ekwu, ị makwa fa naabọ pịaba onwe fa ọkpọ
M wee jụba ife na-ese okwu, a sị na fa naabọ na-azọ nwaanyị azọ
Nwanne, ị na na-azọ nwaanyị azọ? Mgbe i ji azọ ya azọ ka o ji awa
Ọyị nwaanyị abụlọọkwanụ nke ofu onye
Guys na-akpalị onwe ve
M sị okolobịa jee chụba ego
Nwanne, jee chụba ego
Na ị chụta ego ude gị ya-edeluge
Na ụmụnwaanyị ga-akalị gị alụ
Ọ sọ gị jọkwaa njọ nwa monkey
Ude, Ude gwanụ m ka m ma eme
Ude, Ude abaala tulee (Gbam selibe)
Ude, Ude abaala tulee (Gbam selibe)
Ude, Ude abaala tulee (Gbam selibe)
Ude, Ude abaala tulee (Gbam selibe)
Okwu ego nnya ka anyị na-ekwu
Ego bụ mma nwoke
Ị na-eme enyi, makwalụ ụdị enyi ị na-eme
Ọ bụ kwa enyi ga-elite ife?
Ka ọ bụ ka e wete ka e rie?
A fụ guys, e tibe akị, ma a fụ nwaanyị fa ataba ngwọngwọ
M sịkwa a fụ guys, e tibe akị, ma a fụ nwaanyị fa ataba ngwọngwọ
Ị makwa na Ụmụ Obiligbo abịa?
Odenjinji nnenebe mmọnwụ
Mbọsị anyị jelụ n'ụnọ nkwụ
Wee lue n'ụnọ nkwụ, onye na-ele nkwụ wee nyebe anyị mmanya
M wee mebenụ order nkwụ, my guy wee bido iti mkpu
Ọ sị na a ga na-eli ife, na a ga na-aṅụ nkwụ
M jụọ ya, "Ị na-egotekwa ma ncha?"
Mmanya awoof na-egbukwa ajọ ogbugbu
Nwanne, na Ụmụ Obiligbo abịa
Ị makwa na Ụmụ Obiligbo abịa?
Odenjinji nnenebe aṅụlị
Ị makwa na Ụmụ Obiligbo abịa?
Egwu Ụmụ Obiligbo abịa
Ị makwa na Ụmụ Obiligbo abịa?
Akụnwafọ abịa ọzọ, neenu na o luonụ ka o si elu (Ụmụ Obiligbo abịa?)
Ụda egbe ndị nsọ, ị ma na chi na-ekpuge (Gbam selibe)
Ụda egbe ndị nsọ, ị ma na chi na-ekpuge (Gbam selibe)
Unu afụgokwa ndị mgbu?
Fa na-abala Obiligbo mba, a na na-abala agụ mba?
Nwanne adịghị abala agụ mba
Ị baalụ ya mba, onwe gị ka ị na-egbu
M sịnụ ude yị ka ị na-ede
Ude, Ude, gwanụ m ka m ma eme
Wei!
Ị pụta n'ụnọakwụkwọ, university ka m na-ekwu
Ị sị ka ị chọba ada dị mma
Gee m ntị, ka m gwa yị okwu
Eziokwu nnya ka mmụ na-ekwu
Nwanne, ọ bụụ na i bute nnwa Otu, ọ nee gị anya, ọ dị ya ka i ji ego
O neluo gị anya, ọ dị ya ka i ji ego
Ọ ga-akpọ gị sweet, ị za
Kpọkwuo gị my baby, ị za
Tue gị oli ego n'ụkọ ego, leluo ya anya ego gị ka ọ na-achọ
Ị nụlụ ka mmụọ na-ekwu okwu
Odenjinji nnenebe mmụọ
Amalị see (Egwu amalị see)
Amalị see (Egwu amalị see)
Amalị see (Egwu amalị see)
Ijele bụ egwu amalị see (Egwu amalị see)
Amalị see (Egwu amalị see)
Ị makwa na guys na-achazi ajọ anya?
Ị nụkwaa na guys na-achazi ajọ anya?
Nwanne, chakwaa nke isi ga-ebu
Okolobịa chakwaa nke isi ga-ebu
Maka ogo nda ka anyị na-ekwu eeyi
Sị na aka ya awụlụ chi kelụ ụwa, ị nụlụgo eeyi ee (Aka ya awụlụ chi kelụ ụwa)
Nkiliwe aka ya awụlụ chi kelụ ụwa (Aka ya awụlụ chi kelụ ụwa)
Ị ma na aka ya awụlụ chi kelụ ụwa, mgbịlịgba odogwu? (Aka ya awụlụ chi kelụ ụwa)
Ị ma na aka ya awụlụ chi kelụ ụwa, mgbịlịgba odogwu? (Aka ya awụlụ chi kelụ ụwa)
Ị ma na ude dike na-edeluge, ị nụgokwe? (Aka ya awụlụ chi kelụ ụwa)
Egwu anyị nnya ka anyị ji aba
Nnekwute mmọnwụ na-akpọ eeyi
Akụnwafọ, mmụọ ka m na-ebelinu
Njelita ije enu o, limo ka m na-ede (Mụ na chi m elele ka m na-ede)
Njelita ije enu o, limo ka m na-ebe (Mụ na chi m elele ka m na-ebe)
Njelita ije enu o, Imo ka m na-ebe (Mụ na chi m elele ka m na-ebe)
Nnekwute mmọnwụ na-akpọ eeyi (Mụ na chi m elele ka m na-ebe)
Mụ na chi m elele ka m na-ebe
Mụ na chi m elele ka m na-ebe
Mụ na chi m elele ka m na-ebe
Mụ na chi m elele ka m na-ebe
Mụ na chi m elele ka m na-ebe
Written by: Umu obiligbo