Music Video

umu obiligbo - Udo Ga Adi [Official Audio]
Watch umu obiligbo - Udo Ga Adi [Official Audio] on YouTube

Featured In

Credits

PERFORMING ARTISTS
Umu obiligbo
Umu obiligbo
Performer
COMPOSITION & LYRICS
Umu obiligbo
Umu obiligbo
Songwriter

Lyrics

Ije enu ụwa mu na Chi so eje
Obodo ekwelugonụ na mu na Chi so eje
N'akalaka bụ nnya na-edu oo, ee iye
Unu afụgokwenu ude na udo ga-adị
Ka mụ kwubekwenụ ya ọzọ oo
Eeyi na ife ego na-eme (Iyo iyo okokokoo)
Amaliselele (Iyo iyo okokokoo)
Amala welele (Iyo iyo okokokoo)
Iyo okooko, iyo okookooko (Iyo iyo okokokoo)
Amala ise ya ka anyị ji ejebekwe, ngwa
Ụmụ Obiligbo abịagokwe nyi, amalise lele
Akụnwafọ na ọọ kwa mmụ na-ekwu, mụ na Ogbuọzọ nwanne m
Egwu anyị nya ka anyị ji eje
Ka mụ kwubekwenụ ya ọzọ oo
Eeyi iye n'iye okokooko
Egwu anyị ọkwa nya ka anyị ji ana
Ọ kwa egwu ka anyị ji eje iyee ee-e, amaliselele
Mụ na Chi so ejenụ, amala welele
Ka m kwubekwenụ ya ọzọ oo, eeyi iye n'iye okokooko
Akụnwafọ (Ah ahn)
Nya na Ogbuọzọ (Ah ahn)
Udo ka anyị na-achọ (Ah ahn)
Udo a, udo ka anyị na-achọ (Ah ahn)
Ịgba m ee (Ah ahn)
Ịgba m e-e-e (Ah ahn)
Ịgba m ee (Ah ahn)
Ịgba m e-e-e (Ah ahn)
Ịgba m ee (Ah ahn)
Ịgba m e-e-e (Ah ahn)
Ife dị mma bụ udo, udo ahụ ya ka anyị na-achọ
Ka m kwubekwenụ ya ọzọ oo
Eeyi n'ife ego na-eme, iye iye okokooko iyee ee
Amaliselele (Iyo iyo okokokoo)
(Iyo iyo okokokoo)
Olisa Chukwu, onu m ekenee Gị
Obinigwe onu m ekenee, eyi
Ife I kwulu ka mụ na-eme
Udo ka mmụ na-ekwu (Obodo keleenụ Chi m ee)
Na ife dị mma bụ udo, udo ahụ nnya ka anyị na-achọ
Ịgba mụ na Chi so eje iyee ee, amaliselele (Obodo nekwenu chi m ee)
Ịgba mụ na Chi so eje
N'iyo oko, n'iyo okokooko (Ịgba nekwenu Chi m ee)
(Ịgba nekwenu Chi m ee)
(Ịgba nekwenu Chi m ee)
Onye ọbụla chọrọ udo (Ịgba nekwenu Chi m ee)
Asị m, onye ọbụla chọrọ udo (Ịgba nekwenu Chi m ee)
Ebe udo na-alụ ọlụ, ebe afụ ka ife dị mma na-abịa
Ị na-anụ ka mmụ na-ekwu eeyi? Amaliselele (Ịgba nekwenu Chi m ee)
Olisa Chi m ee, bịa wetekenenụ udo n'ezinaụlọ niile (Ịgba nekwenu Chi m ee)
Ayịyọ nya ka mmụ na-ayọ, ị na-anụ ka mmụ na-ebele enu? (Ịgba nekwenu Chi m ee)
I nelue anya, ọ bụ na nne gị na nna gi
Na fa naabọ bụ ilo ọnwe fa, ọ na-emetụta ụmụaka
Ọ na-egbochikwa ụzọ, ị na-anụ ka egwu na-ekwu? (Ịgba nekwenu Chi m ee)
(Ịgba nekwenu Chi m ee)
Ezinaụlọ na-enwelụ udo, na ife dị mma na-agbalụ fa ọsọ
Dị na nwunye sebe okwu, ọganilu na-agbalị fa ọsọ
Ụmụ fa mụlụ agbasasịa (Ịgba nekwenu Chi m ee)
M sị, ụmụ fa mụlụ agbasasịa (Ịgba nekwenu Chi m ee)
Obodo na-enwelụ udo, ọganilu na-agbalị fa ọsọ
Ọ kwa fa achịlị egbe n'aka?
Ife m fụlụ ka mụ na-ekwu okwu ya, amalisee (Ịgba nekwenu Chi m ee)
Nke kasị njọ n'ụwa a bụ na di na nwunye sebe okwu
Di na nwunye sebe okwu, ife izizi ọ ga-eme fa
A bịa nne akpọkọlu ụmụ ya, sị fa na papa fa na-egbu fa egbu
Na ọ na-ata amoosu, ọ kwa ka fa gbabalụ nna fa ọsọ
Nne akpọkọlu ụmụ ya, nwoke nwe ụnọ a na-ebe akwa, eyi
Oké echiche ezue nya alụ
Nnya bụ na nwoke na-anwụ n'ọge
Eewuu meeyi, eewu Chukwu, akwa alịlị nya ka mmụ na-ebenụnụ
Eeyi iye n'iyo okokooko, ị na-anụ ka egwu na-aranụ ee? Amaliselele
Ịgba m ee (Ah ahn)
Ịgba m ee-e-e-e (Ah ahn)
Ịgba m ee (Ah ahn)
Ịgba m ee-e-e-e (Ah ahn)
Ịgba m ee (Ah ahn)
Ịgba m ee-e-e-e (Ah ahn)
Na ife dị mma bụ udo, udo afụ nya ka anyị na-achọ
Ị na-anụ ka egwu na-aranụ ee? Amaliselele
Nwoke chụsia ego ka ọ nata, oke echiche ezue ya alụ
Ọ bịazie o tinye uche na mmanya
Ọ ṅụsịa ya, o gbube ya egbu
Ka o wee chefunata ife ọ na-afụ n'ụnọ ya (Ịgba nekwenu Chi m ee)
Ị fụlụ ndị amụma ụgha? Fa na-ekposasi ụnọ ọfụma
A bịa o bubelụ gị amụma sị na papa gị na-egbu gị egbu
A bịa o bubelụ gị amụma sị na nne gị na-achọ gị ọnwụ
Mmadụ a ga-amụsị nnwa, chọbakwa ka o gbue ya egbu?
Ajụjụ ka m na-ajụ, ajụjụ m jụrụ, onye ga-aza m ya ee? Amaliselele
Nelue ọnwe gị anya, makwalụ ife ị na-eme
Ome mma na mma yị ana, ome njọ na-egbu onwe ye
Ị na-anụ ka mmụ na-ekwu?
Oziọma ka m ji eje
Ndị amụma ụgha, unu na-achọkwa Chukwu okwu, eeyi, ịgba m ee
Iko i ji malụ mmadụ ibe gị, ọ kwa nnya ka e ge-ejikwa wee majuolụ gị ụkpa
Ị na-anụ ka egwu na-ara? Makwalụ ife ị na-eme
Olisa Chi m ee, bịa chebekwelụ mụ nne m
Olisa Chi kelụ m, bịa chebekwelụ mụ nna m
Nne na-enekwa nnwa, ma nna ji isi aghọ mgbọ
Nna na-edozi obi, ndị ilo na-asọ nna anya
Ị na-anụ ka mmụ na-ekwu? Akụnwafọ na ọọ mmụ na-ekwu
Ka mụ kwubekwenụ ya ọzọ oo, eeyi iye n'iyo okokooko (Iye iye okokookoo)
Eeyi iye na ife ego na-eme, iye iye okokookoo iyo oo, amaliselele (Iye iye okokookoo)
Asị na papa m anụlọọ nne m, ọọ dị onye ga-amụta Akụnwafọ n'ụwa?
Ya na Ogbuọzọ, iye iye okokookoo iye (Iye iye okokookoo)
Ụfọdụ na-eti mpa fa ife, maka na ọ kago nka
Ọọ zikwa onye kalụ nka, ọ dịka ọ ṅụlọọ ala nne ye
Ị na-anụkwa onu m? Nwoke ga-afụ ife ibe ye na-afụ
Ị ka ya-amụta nnwa, and ị ka ya-akakwu nka
Ị kasịa nka, mgbe afụ nnwa gị tie gị, ka ị fụ ka ụwa si adị
Ngwa nelue onwe gị anya, ọ bụlụ na ị na-eti mpa gị ife
Yọkwaa nya ka ọ gbayalụ gị, ị na-anụ ka mụ na-ekwu?
M wee tie okokoko iyee, amaliselele (Iye iye okokookoo)
M wee tie okokoko (Iye iye okokookoo)
Akụnwafọ n'iye okokoko (Iye iye okokookoo)
Ịgba na ife ego na-eme (Iye iye okokookoo)
Akụnwafọ tie okokokoo (Iye iye okokookoo)
Ogbuọzọ tie okookooko (Iye iye okokookoo)
Iye iye okokookoo (Iye iye okokookoo)
Iye oko iye okokoko (Iye iye okokookoo)
Amaliselele (Iye iye okokookoo)
(Iye iye okokookoo)
(Iye iye okokookoo)
Written by: Umu obiligbo
instagramSharePathic_arrow_out