Similar Songs
Credits
PERFORMING ARTISTS
KCee
Performer
COMPOSITION & LYRICS
Kingsley Okonkwo
Songwriter
PRODUCTION & ENGINEERING
Akaz
Producer
Lyrics
Elu ụwa nke a, ehh
Elu ụwa nke a dị egwu oo
Elu ụwa nke a, ehh
Alaeze eluigwe amaa m ebe m ga-ebido ebido oo
Ụwa nke a leeyi, eeyi, eeyi
Elu ụwa nke a dị egwu oo
Elu ụwa nke a, ehh
Alaeze eluigwe amaa m ebe m ga-ebido ebido oo
Ị makwa otu ọ dị n'eluigwe ee
Ọ bụrọọ otu ahụ ka ọ dị n'elu ụwa
Alaeze nke Nna m oo
Alaeze eluigwe amaa m ebe m ga-ebido ebido oo
Elu ụwa nke a, ehh
Elu ụwa nke a, eh ehh
Elu ụwa nke a, ehh
Alaeze eluigwe amaa m ebe m ga-ebido ebido oo
Meta onye dị mma enyi
Eehh, meta onye dị mma enyi ee
Eehh, meta onye dị mma
Ị na-eme ọyị, meta onye dị mma maka ọlụlụ
Meta onye dị mma enyi
Eehh, meta onye dị mma enyi ee
Eehh, meta onye dị mma
Ị na-eme ọyị, meta onye dị mma maka ọlụlụ
Eehh, maka gịnị ee?
Maka ọlụlụ
Eehh, maka gịnị ee?
Maka ọlụlụ
Eehh, maka gịnị ee?
Maka ọlụlụ
Eehh, maka gịnị ee?
Maka ọlụlụ
Nna m eze, akpata m enyi
Nna m eze, akpata m enyi
Nwambe, ị sị na ị kpata onye?
Nwambe, ị sị na ị kpata onye?
Asị m anị ya dube enyi, chebe enyi
Ọ dị ka asị m akpata m enyi
Asị m anị ya dube enyi, chebe enyi
Ọ dị ka asị m akpata m enyi
Ọ bụ enyi ga-abụ isi oche?
Ọ bụ enyi ga-abụ isi oche
Enyi na-aga na anyị so gị n'azụ (Gwọgwọgwọm gwọ)
Opi m, fụtelụ m Omekagụ
Fụtelụ m Omekagụ
Na Omekagụ riri ji mmụọ
Na Omekagụ riri ede mmụọ
Ọ bụrụ na ị fụtelụ m Omekagụ
Fụtelụ m Omekagụ ka m welụ ebule gbaa ya aka
Ọ bụrụ na ị fụtelụ m Omekagụ
Fụtelụ m Omekagụ ka m welụ ebule gbaa ya aka
Ọ kwa gị jide ogu, jide ọfọ?
Ọ kwa gị jide ogu, jide ọfọ?
Oo, oo, o o, oo, oo, o, o
Obiakọ, Obi nnwa (Awanjeje, Obiakọ, Obi nnwa, awanjeje)
Obiakọ, Obi nnwa (Awanjeje, Obiakọ, Obi nnwa, awanjeje)
Leekele ijele mụ oo (Awanjeje, ijele mụ ji eje mba, awanjeje)
Leekele ijele mụ oo (Awanjeje, ijele mụ ji eje mba, awanjeje)
Obiakọ, Obi nnwa (Awanjeje, Obiakọ, Obi nnwa, Awanjeje)
Obiakọ, Obi nnwa (Awanjeje, Obiakọ, Obi nnwa, awanjeje)
Ihe ọma lee (O nwee onye ọ sọ nsọ ee?)
Ihe ọma lee ee (O nwee onye ọ sọ nsọ ee?)
Na my dad wụ eze (O nwee onye ọ sọ nsọ ee?)
E-Money nwanne m abaana (O nwee onye ọ sọ nsọ ee?)
Culinary sets, nwanne m (O nwee onye ọ sọ nsọ ee?)
Mercedese-Benz (O nwee onye ọ sọ nsọ ee?)
Ihe ọma mụ eehh (O nwee onye ọ sọ nsọ ee?)
Onye ụta atakwala m n'ụwa, onye ajụjụ ajụkwala m eehh
Ọzọ bụ iwe (Ọzọ bụ iwe mụ oo)
Ọzọ, ọzọ, ọzọ eehh (Ọzọ eehh)
Ọzọ bụ iwe (Ọzọ bụ iwe mụ oo)
Ọzọ, ọzọ, ọzọ, ọzọ, ọzọ eehh (Ọzọ eehh)
Ọzọ bụ iwe (Ọzọ bụ iwe mụ oo)
I biri oo, i biri ka m biri
I biri oo, i biri ka m biri
Onye azọla ụwa azọ, ụwa ga-abazi onye ọbụna oo
I biri oo, i biri mụ ebiri oo
I biri oo, i biri ka m biri (I biri oo)
I biri oo, i biri ka m biri
Onye azọla ụwa azọ, ụwa ga-abazi onye ọbụna
I biri oo, i biri ka m biri
Ụmụ Naịjirịa (Nweenụ ndidi oo)
Ụmụ Igbo beanyị oo (Nweenụ ndidi oo)
Jisienụ ike, anyị kwụ unu n'azụ
Chukwu enyego anyị oo
Ndị na-agụ science, science na technology, ha abatago obodo anyị oo
Olisa enyego anyị oo
Ndị na-agụ science, science na technology, ha abatago obodo anyị oo
Industry adịgo, anyị na-alụzi nke anyị oo
Factory adịgo, anyị na-alụzi nke anyị oo
Jeekene afịa ka ị fụ ihe ndị be anyị na-alụ n'aka
Gaalịba obodo ka ị fụ ihe ndị be anyị na-alụ n'aka
Anyị nwelụ nchekwube, na ife ga-adị mma
Ife dị ọkụ ga-ajụ oyi, mana ọ chọlụ ndidi oo
Ndidi oo (Ndidi oo)
Ndidi oo (Ndidi oo)
Ndidi oo (Ife ga-adị mma, nweenụ ndidi oo)
Nwa ada dị mma (Who born this fine girl?)
Nnwa nwaanyị ọma nta
Onye mụrụ nnwa a lee?
Onye mụrụ nnwa a eehh?
Papa mụta nwaanyị dị mma, kpọịga onye ọzọ ọ lụma eh
Iyoo, iyoo, iyoo, okooko
Mama mụta nwaanyị dị mma, kpọịga onye ọzọ ọ lụma
A na-enwe obodo enwe
A na-enwe obodo enwe
Obodo adịghị ekolụ n'ụgbọgụlụ
A na-enwe obodo enwe (Welụ ya gaba)
A na-enwe obodo enwe (A na-enwe obodo enwe)
A na-enwe obodo enwe, obodo adịghị ekolụ n'ụgbọgụlụ
A na-enwe obodo enwe
O nwelụ ndị nwe obodo enwe
E-Money nwe obodo enwe
Obodo adịghị ekolụ n'ụgbọgụlụ
A na-enwe obodo enwe (Welụ ya jebe)
A na-enwe obodo enwe (Ehn)
A na-enwe obodo enwe, obodo adịghị ekolụ n'ụgbọgụlụ
A na-enwe obodo enwe
Ei! Onye na-eme ka m si eme
Ị ma na onye na-eme ka m si eme
Onye na-eme ka m si eme
Ya ka m ga-akpọ ọyị m oo, ọyị m ọma
Onye na-eme ka m si eme
Onye na-eme ka m si eme
Onye na-eme ka m si eme
Ya ka m ga-akpọ ọyị m oo, ọyị m ọma
Ị ma na o tiwaala m ogbe (Ayaya oo o)
O tiwaala m ogbe (Iyoo oo ma)
Ị ma na o tiwaala m ogbe (Ayaya oo o)
O tiwaala m ogbe (Iyoo oo ma)
Ị ma na e tiwaala m ogbe (Ayaya oo o)
O tijiele m ukwu (Iyoo oo ma)
Ị ma na ọ kụjiele m ukwu (Ayaya oo o)
O tijiele m ogbe (Iyoo oo ma)
Ah eh, ah eh (Ah eh)
Ah eh, ah eh (Ah eh)
Ah eh, ah eh (Ah eh)
Ọ bịara ije ga-ana
Ah eh, Ah eh, ah eh (Ah eh)
Ah ah ah ah ah eh (Ah eh)
Ah eh, ah eh (Ah eh) oh
Ọ bịara ije ga-ana
Obi kererenke (Obi)
Kererenke (Obi)
Kererenke (Obi)
Nwoke ndị army (Obi)
Nwaanyị ndị army (Obi)
Kererenke (Obi)
Kererenke (Obi)
Kererenke (Obi)
Ebezina, ebezina, ebezina, ebezina
Ebezina, ebezina, ebezina, ebezina
Ebezina, ebezina, ebezina, ebezina
Ebezina, ebezina, ebezina, ebezina
Ebezina, ebezina, ebezina, ebezina
Ebezina, ebezina, ebezina, ebezina, ebezina
Onye metere agụ nọ n'ụla
Ei, agụ na-abịa eeh
Onye metere agụ nọ n'ụla
Agụ pụta gị agbala ọsọ
Onye metere agụ nọ n'ụla
Agụ na-abịa eeh
Onye metere agụ nọ n'ụla
Agụ pụta agbala ọsọ
Onye metere KC nọ n'ụla
Ei, agụ na-abịa eeh
Onye metere agụ nọ n'ụla
Ei, agụ pụta gị agbala ọsọ
Onye metere agụ nọ n'ụla
Agụ na-abịa eeh
Onye metere agụ nọ n'ụla
Ei, agụ pụta agbala ọsọ
Ife e ji ama ndị akụ fa kalịsịlị (Si n'ekike)
Ife e ji ama ndị ife na-agalụ ọfụma (Si n'ekike)
Ngwa, fa kesịa ekike, fa akpala ọfọ n'aka, ọ bụrụ iPhone
Ọgịlịga bụ ọgalanya, ndị ọgịlịga wụrụla mma
Chief Dr. E-Money, nwanne (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Nwa a na-ayọ eze na ala Uli (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Bullion van ndị Igbo niile (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Kee maka lọọlọ gị? (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Lọọlọ Nnwaanayọeze (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Mrs. Juliet Okonkwọ (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Keneere m lọọlọ mụ (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Mrs. IJ Okonkwọ (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Lọọlọ m ji eku ume (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Ọgịrịga wụ ọgaranya (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Kelewerenụ m Limpopo (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
William K ụwa niile (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Ọgịlịga wụ ọgaranya (Ndị ọgịlịga wụrụla mma)
Ego ji ọlụ eeh! (Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie)
Mmm, ego ji ọlụ (Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie)
Mmm, ị ma na akụ na-etigbu ilo, nwanne? (Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie)
Ọ kpawa ego n'ụkọ ego (Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie)
Maka na ego bụ mma nwoke (Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie)
Mmm, ego ji ọlụ (Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie)
Eliwe! Ego ji ọlụ oo, ego ji ọlụ oo (Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie)
Ego ji ọlụ (Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie)
Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie (Iyoo, iyoo na ọ bụ ezie)
Written by: Kingsley Okonkwo