Featured In

Credits

PERFORMING ARTISTS
Umu obiligbo
Umu obiligbo
Vocals
COMPOSITION & LYRICS
Obiligbo Ebuka
Obiligbo Ebuka
Songwriter
Obiligbo Ifeanyi
Obiligbo Ifeanyi
Songwriter

Lyrics

Eji egwu a edu onye ụjọ
Ejilọ egwu a edu onye ụjọ
Ọbụdị onye ka anyị na-atụ egwu? Sọ Chukwu
Ojonjoloko ụwa wụ ojonjoloko
Asị m, "ọbụdị onye ka anyị na-asọ anya? Sọ Chukwu
Obonboloko, ụwa wụ ojonjoloko
Ọdị onye na-esi ngọ, ahan
Kedụ onye na-esi ngọ
A na-abala agụ mba? Onye na-achọ nwa agụ okwu
Egwu nwa bụ egwu ikolobịa, gwakwa onye na-esi ngọ, na ife nwa bụ ife mmụọ
Ojonjoloko, ụwa wụ ojonjoloko
Egwu ọ na-atụ afọ, obulu ụzọ ka m jụa
Ọnụ lili udene eligo ajọ nni, oo
Inenie ite, ọnyụọ ọkụ anya
Gwakwa onye na-atụ ụjọ, "egwu nwa bụ egwu ikolobịa
Ejilọ ya edu onye ụjọ, olo oo, lo
Eji egwu a edu onye ụjọ?
Ejilọ egwu a edu onye ụjọ
Ọbụdị onye ka anyị na-atụ egwu ọzọ?
Eji egwu a edu onye ụjọ?
Iyooo o
Ejilọ egwu a edu onye ụjọ
Ọbụdị onye ka anyị ga-agbalụ ọsọ na ọlụ a
Eji egwu a edu onye ụjọ?
Iyooo o
Ejilọ egwu a edu onye ụjọ
Anyị niine bụ ndị njọ ooo
Anyị niine na-eme njọ ee
Asị m, "onye ga-ejedị enu igwe"? Ka m jụọ
Onye ga-ejedị enu igwe, iyoo
Ọbụlụ ka m kwuo uche m, e
Ụganị bụ ọkọ mmụọ, ọgalanya bụ enu igwe
Ojonjolooko, ụwa wụ ojonjoloko
Ụwa bụ imebe ọfụma, akụọlụ gị aka
Ịkpataba ego, etibelụ gị mkpu
Ọkwa onye zọba ọchịchị, omebe onye nsọ
Mana ọzọta ọchịchị ọbụlụ anụ mkpọ
Ife okwelụ na nkwa ga-afịabanụ ya alụ
Ọbụdị onye ga-ejedị enu igwe? ooo, e
Ojonjoloko, ụwa wụ ojonjoloko
Ọkwa onye chọba nke ya, ọbụlụ ajọ nwa
Ịmụta jonsing, mụtakwa ịgba ọsọ
Makana onye dị ndụ na-afụnụ echi anya
Ịrapụkwa Nkechi, olie nni nwa, ooo
Eji egwu a edu onye ụjọ?
Iyoo o
Ejilọ egwu a edu onye ụjọ
Ọbụdị onye ka anyị ga-agbalụ ọsọ na-ọlụ
Eji egwu a edu onye ụjọ
Iyooo o
Ejilọ egwu a edu onye ụjọ
Ọbụdị onye ka anyị ga-atụlụ egwu ọzọ?
Eji egwu a edu onye ụjọ
Iyooo oh
Ejilọ egwu a edu onye ụjọ
Ojonjoloko ụwa wụ ojonjoloko
Obonboloko ụwa wụ obonboloko
Nwa Awusa eme m ịwa, omelụ m ịwa
Ebe m na-eme ọnụ, ama m na fa na-esi ike
Ebe m na-aba mba, ama m na fa na enwe ume
Ofu ịcho na-egbu ife, ngada fa na-ara ọnụ
Ụbịam bụ ọkụ mmụọ, ọgaranya bụ enu igwe
Obonboloko, ụwa bụ obonboloko
Jejenje ooh
Jejenje ooh
Jejenje ooh
Jejenje ooh
Jejenje ooh
Jejenje o, hoo-ooo
Written by: Obiligbo Ebuka, Obiligbo Ifeanyi
instagramSharePathic_arrow_out