Top Songs By High Life Kings Vol1
Credits
PERFORMING ARTISTS
High Life Kings Vol1
Performer
COMPOSITION & LYRICS
High Life Kings Vol1
Songwriter
Lyrics
[Verse 1]
Kwue nke yị bụ afa mmadụ
Onye ga-aghọlụzi isi ihe onye ọzọ na-aghụ?
O welụ ya jee tụpado n'anya nke ya
Onye na nke ya nụ
Ọ bụ onye kwute okwu isi onwe ya
Ị ga-aghalụ nke yị, jee kwuwe nke onye ọzọ?
Maka ife dị onye mkpa n'ụwa ka ọ na-achọnụ
Onye ga-aghazi nke ya, jee chọba nke onye ọzọ?
Kwue nke yị oo
Hakwaalụ mụnwa nke m ka m kwulu nụ
Maka na ọ wụ ajọ ife na-akpa yị, na-akpa m
[Verse 2]
Onye pụtalụ ụwa nụ, o kwulunụ nke ye
Haanụ m nke mụ nụ, na mụ na Chi m na-aga
Ọ bụ ke yị ka m ji aga n'ụwa nụ oo?
Ọ kwa m kpute, m kwuru mkpa m n'ụwa m oo
Onye ọma, ị pụta, i kwuru mkpa yị n'ụwa nụ
Onye ekwunerụ m nke m, ọnụ Chi nyere m na ọ dị fu nụ
Ọ bụ ngị ga-ekwuchiri m ọnụ m n'ụwa nụ?
Na ife anya mmadụ fụụ n'ụwa, ka ọ na-ekwu nụ
Onye ga-ekwuzi nke anya ya na-afụazinụ?
Nya bụ na mkpa yị ka ị ya-ekwu nụ
Ekwuchinarụ m ọnụ m nụ
Ọ bụzi ngị bụ Chi kelụ m?
Na mbọsị onye ọbụla na-apụtazi n'ụwa nụ
Onye ọbụna n'oche nke ya oo
Etu oche yị dị ka ọnụ okwu gị ya-adịazi
Nya bụ onye pụta, nya kwulu nke ya
Onye ekwuchinarụ onye ọzọ ọnụ ha
[Verse 3]
O luzienụ n'omume nụ
Onye pụta, o mee ka ike ya ha n'ụwa nụ oo
Mbe naabọ pụtalụ nụ mgba nụ
Ofu ya aka ibe mbembe afọ nụ
A sị na mbe naabọ pụtaziri mgba nụ
Ofu ya-akarịrị ibe ya mbamba afọ
Ya bụ na o luo n'omume
Onye pụta, o kwulu ọnụ ha
Ọ bụ onye ga-azọlụ nke onye ọzọ nụ?
Ọ dịakwa nụ ofele oo
Written by: High Life Kings Vol1